Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a.

  • Vivian, C. Chibundu Alvan Ikoku Federal University of Education Owerri.
  • Pauline Chinasa Nwizu Alvan Ikoku Federal University of Education Owerri.
Keywords: Ọzợ, Omenala, akamgba

Abstract

Nchọcha a na-eleba anya n’ụfọdụ ihe nramaahụ di n’echimechi ọzọ dị ka o si metụta mmekọrịta mmadụ, omenala nakwa akụnaụba n’oge ugbu a. Nchọcha a kpợmkwem na-akọwa usoro dị iche iche e si echi ọzọ n’Ebenatợ Ọlụ Gedegwum, nke dị n’ochichi ime obodo Ọlụ. E lebakwara anya n’uru na nsọ dị n’echimechi ọzọ, kọwakwaa ugwu na nsợpụrụ a na-enye onye chiri ọzọ n’ala Ebenatọ-Ọlụ Gedegwum. Usoro nnweta njantụle (data) bụ site n’ajụjụ ọnụ a gbara ndị nze anọ nakwa ihe nlereanya ebe a na-echi ọzọ.  Atụtụ e jiri mee nchọcha bụ atụtụ Marxist nke Karl Marx na Friedrich Engels tụpụtara n’ime afọ cenchuri iri na itolu, nke kọwara etu ego si achi ụwa. Site na ntọsasi njantule enwetagasiri, a chọpụtara na ọzọ bu nnukwu echichi e ji ama onye nwere akụnaụba, ugwu na nsopụrụ n’ala Igbo. A chọpụtakwara na oke mmefu akụnaụba di n’echichi ọzọ, ebe a na-esi, anu nakwa nnukwu isi ego a na-akwu ndi ọzọ ga-ekeri, oke iwu na nsợ dị iche iche dikwa na ya, okpukpere chi ọlọrọọhụrụ socha n’ihe na-achịrị echimeche ọzọ akamgba n’Ebenatọ- Ọlụ. A tụrụ elo ka ewebilata oke mmemme na oriri a na-akpợ ugboro ugboro na usoro di iche iche di n’echimechi ọzọ nke na-ewe ọtụtụ akụnaụba onye nwere mmasị ichi ọzọ. A tụkwara elo ka e wepụga ụfợdụ nsợ ndị megidere ụka na mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’echimechi ọzọ. E mee nke a, ọtụtụ ihe nramaahu di n’echimechi ọzọ ga-ebelata, ọtụtụ mmadụ ga-enwekwa mmasị n’ichi ọzọ. Nke a ga-akwalite ợnợdụ obibi ndu, ezi mmekọrịta nakwa mbawanye akụnaụba nke mba ụwa n’oge ugbu a.

Author Biographies

Vivian, C. Chibundu, Alvan Ikoku Federal University of Education Owerri.

School of General Studies

 

Pauline Chinasa Nwizu, Alvan Ikoku Federal University of Education Owerri.

School of General Studies

 

References

Ahamefule, I.C. (2015). Ọzọ title and Indigenous Capital Formation in Igbo Society, Southeast Nigeria, 1900-2015
Anikwe, F.I. (2019). The Value of Ọzọ Insitution: Template for New Igbo Civilization. In N. Omenka, I. Ani & K. Obodoagu, (The Relevence of Higher Education to Human and National Development in Nigeria (pp 225-237). Enugu: JOMAP Press.
Ngwu, I. (2011). Ukehe, Origin and Genelogy, Culture, Growth and Development. Nsukka, Chinedu Printing Press.
Nwizu, P.C. Obiakor, E.E. Egonu, N.G. (2014) Nghota Asụsụ Igbo. A Second Language Learning (L2) Owerri: Hysab Prints & Publishers Ltd.
Odigbo, I. (2012) Aspect of Igbo Cultures and Traditions: From the Prospective of Ụmụlumgbe Town Enugu: DULAC Press.
Odigbo, I.M. (2023). Ọzọ title and Socio-Economic Recogniton in Igboland: A Philosophical Analysis Sapietia. Journal of Philosophy, 17.
Published
2024-07-19